Ofho d'ishi, nweze awuwa, eze dagwu. Aka m nene, a na-ejhe njhe. O maar' onye nke ae bu nene. Okpoto unazhi, eka adu nkwukwuwa, omaar' onye nke ae bu nene. Obibio, okuchie. Okuku no n'ekpa fhu nkwo-oringwere. Azhi no n' mirhi afhu uzo. Oyowe, oyopiere ejha. Ofho shir' nwata goo yae, okookpa goo yae, onye o kakwa duru ishi, o reerea. Ojher'aeru nata ugwo. Ofho, I bu ekpekee uno, afhu nku. Ofho, o bu gh' bu ovu uzo ma na-arhibute onye kpe azhi okpa. Ofho ne aejha an'. Ofho, takwar' Oji. Okpe ikpe oha, nekwe anyi enya n'ume, enehokwee anyi enya n'ishi, maka na anyi amaho ihe ishi fhuru, wee vuo ganaa. Ojer'aeru nata ugwo, kpachakwar'umu gh' aezhi ufhu. Zekweeru anyi nd' obia njuta ha onu, o du ka okpakwutea. Kpachakwar' anyi nd' echee na-ayi, man' ayihokwa. Woongekwer' umu gh' njho nwunyeji okwu n'ukoezhi, egbe vukwerea, ma vuru ukoezhi. Ofho n'eputu aejha an'. Kpachar' anyi odu ndu, ero i...
Comments
Post a Comment